ASỤSỤ IGBO

CLASS: JSS 2

ISIOKWU: ATỤMATỤ

 OKWU (FIGURES OF SPEECH)

 

    Atụmatụ okwu bụ nka dị iche iche e ji achọ okwu maọbụ edemede mma. ọ bụ asụsụ nka nke ọkaokwu na-ewebata n’okwu iji mee ka ọ di ụtọ na nti.Atụmatụ okwu chọrọ echiche miri emi maka nghọta ya.

Omumaatụ

 MBỤRỤ(METAPHOR)

    MBỤRỤ bụ atumatụ okwu na egosi na ihe abụọ a na-ekwu maka ha bụ otu ihe kpọmkwem na “A” bụ “B”. ihe e ji ezipụta mbụrụ na asụsụ lgbo bụ……”BỤ”.mbụrụ na-egosịpụta ọdidi ihe maọbụ omume mmadụ ọmụmaatụ:

ọ bụ agụ ọ bụ nkịta, ọ bụ unyi, ọ bụ unyi,  ọ bụ ezi dgz.

 MBỤRỤ NA NKỌWA YA

                    

1)Ọ bụ edi

NKỌWA HA

Ọ na-arahụ oke ụra

2)MBỤRỤ

Ọ bụ unyi

NKỌWA HA

Ọ na-eji oji nke ukwu

3)MBỤRỤ

   Ọ bụ eriri ọkazi

NKỌWA HA

ọ tara ahụ

4)MBỤRỤ

ọ bụ ụtara ede

NKỌWA HA

 O sighi ike

5)MBỤRỤ

 Ọ bụ atụrụ

NKỌWA HA

Ọ na-ezuzu ezuzu

6)MBỤRỤ

 Ọ bụ ụsụ

NKỌWA HA

Ọ jọrọ njọ mmadụ

7)MBỤRỤ

Ụmụ ya bụ aja di n’ala

NKỌWA HA

ụmụ ya bara ụba

8)MBỤRỤ

ndi anam bụ azụ na

NKỌWA HA

Ndi anam na-egwu mmiri nke ọma.

9)MBỤRỤ

Ọ bụ ezi

NKỌWA HA

ọ na-eru unyi nke ukwu.

10)MBỤRỤ

Ọ bụ mbe

NKỌWA HA

Ọ na-aghọ aghụghọ

 

Download Document Here: JSS 2 ASỤSỤ IGBO

Leave a Reply