ASỤSỤ IGBO 

ISI OKWU:AGỤMAGỤ E DERE EDE

JSS2.

Agụmagụ e dere ede so na otu ngalaba agụmagụ lgbo.

Agụmagụ e dere ede bụ agụmagụ di iche iche e depụtara na akwụkwọ. ọ bụ mgbe agụmakwụkwọ biara n’ala lgbo ka e bidoro ide agụmagụ e dere ede.

Agụmagụ e dere ede bụ nke di n’akwụkwọ nke mmadụ nwere ike izụta, gụọ ya n’echeghị ka ọkọ akụkọ bịa kọọrọ ya.

Ọtụtụ agụmagụ e dere  ede bụ;-

(i) akụkọ ifo. (ii) akụkọ ọdinaala.

(iii) akụkọ a rọrọ arọ(fiction) (iv) akụkọ ihe  mere eme. (non fiction)(v) ejije na abụ.

Agụmagụ e dere ede na-agbadokarị ụkwụ n’ihe dịka; akparamagwa ọha na eze, ọchịchị gọọmentị, akụ na ụba , ofufe na nkwenye ndị lgbo.

Agụmagụ e dere ede na-eleru anya ala n’ihe ndị na-aga n’etiti ọha na eze, gbaa ha n’anwụ ọ na- ewekọta ochie na ọhụrụ ọnụ, tọgbụ ha, otu n’akụkụ ibe ya, gosị oyiri maọbụ ndịiche.

 

NJIRIMARA AGỤMAGỤ E DERE EDE

(A)Agụmagụ e dere ede bụ nke e depụtara n’akwụkwọ.

(B)A maara ndi  dere ya maọbụ onye dere ya.

(CH) Amaara mgbe e dere agụmagụ ndị a.

(D)A na-agụ ya mgbe ọbụla.

 

URU AGỤMAGỤ E DERE EDE BARA

(A) ọ na-enye nkuzi dị mkpa

(B)E ji ya echere oge.

(CH) Ọ na-enye ego.

(D) Ọ na-enye obi aṅụrị maọbụ obi ụtọ.

 

NGALABA AGỤMAGỤ E DERE EDE

Agụmagụ e dere ede nwere ngalaba ndi a:

(a) lduuazị (prose)

(b)Ejije(drama)

(c)Abụ(poem)

IHE OMUME

1)Depụta ngalaba abụọ e kere agụmagụ lgbo.

2)Gini bụ agụmagụ ọdinaala ?

3)Olee ihe atọ e ji mara agụmagụ ọdinaala?

4)Olee ihe bụ agụmagụ ụgbu a?

5)Kedụ ihe atọ e ji mara agụmagụ ugbu a.

 

Download Document Here  ASỤSỤ IGBO JSS 2

Submit assignment via WhatsApp to 0906 345 2660, or at the school’s security post

Leave a Reply