ASUSU IGBO
(JSS1)
ISIOKWU:OKWUIHU NA OKWUOZI (Direct And Indirect Speech)
Okwuihu bụ okwu e kwuru dịka onye kwuru okwu si kwuo ya n’ewepụghị ihe ọbula maọbụ tinye ihe ọbụlaA na-etinye akarangwụ (” “)n’okwuihu ọbụla n’asụsụ igbo .Ọmụaatụ:
- a) okeke sịrị, “Chukwu gọzie gị”.
- b) Nna m sịrị, “Gaa ije gị nke ọma”.
- ch) Nneka sịrị, “Jeenu ahịa”.
- d) obika sịrị, “Ewu ataala m igu n’isi”.
- e) Nwoke ahụ sịrị “Ahụ ọ dịkwa m”?
OKWUOZI (Indirect speech)
Okwuozi bụ okwu mmadụ kwuru a kọwara n’ụzọ ọzọ N’okwuozi,a na-enwe ihe mgbanwe n’ihi na okwu anaghizi adi ka onye kwuru ya si kwuo ya. A na-ewebata ụmụ irighiri ihe n’okwu ahụ iji kọwapụta okwuozi a naghị etinye ya akara ngwu ọmụmaatụ:
a)okeke sịrị {ka} chukwu gọzie gi.
- b) Nna m sịrị {ka} ị gaa ije gị nke ọma
- ch) Nneka sịrị ka ụnụ jee ahịa.
- d) Obika sịrị na ewu ataala ua igu n’isi.
e)Nwoke ahụ jụrụ ihe bụ aha gi.
ỊTỤGHARỊ OKWUIHU KA HA BỤRỤ OKWUOZI
Mgbe ụfọdụ mmadụ na-akọ ihe onye ọzọ kwuru,a na-eji okwu njikọ “na” egosịpụta ya.Rịkọm ngwu dị n’okwuihu ga-apụ kpam kpam.ọmumaatụ:
i)ugomma sịrị, “ahụadighị m”.(okwuihu)
ugomma sịrị {na} ahụ adịghi ya (okwuozi)
- ii) ọ si, “Aga m eje ahịa” (okwuozi)
ọ sị na ya ga-eje ahịa.(okwuozi).
- B) A na-eji “ka” atụghari okwu e kwuru ka ọ bụrụ okwu a kọrọ akọ ma ọbụrụ na okwu ahụ e kwuru bụ aririọ maọbụ okwu mmanye.
omụmaatu
- i) Ha sịrị, ” Biko, meere anyi ebere”(okwuihu)
Ha rịọrọ ka e meere ha ebeere(okwuozi)
- ii) Azụka sịrị “chukwu meere ya ebere”(okwuihu)
Azụka rịọrọ ka chukwu meere ya ebere(okwuozi).
Download Document Here: JSS 1 ASUSU IGBO