Izu Nke Abuo(J s s 2)
Isioukwu. : (OMENALA) OJI
Oji bu mkpuru Osisi Oji Miri, o bu mkpuru osisi pere mpe nke ndi igbo na enye ugwu na nsopuru puru iche .E ji ya anabata obia iji gosi ezi nn
abata anabatara onye ahu.

UFODU IHE NA ANOCHI
ANYA OJI N’ALA IGBO
(1). Ahuekere
(2) Mmiri
(3) Akiilu
(4) Abacha
(5) Ose oji
URU OJI BARA N’ALA IGBO:
Oji Baara Ndi Igbo Otutu Uru. Karisia iji ya eme emume omenala ndia:
(a) Igo ofo
(b) Ichu aja
(c) Ile obia
(d) Idu isi/inu iyi
(e) Ilu nwanyi
(f) Igba ndu
(g) Irio aririo
(h) Idozi Ikpe ala
(I) Igo mmuo
(j) Ilu nwanyi

NSO DI ICHE ICHE A NA A SORO OJI;

Nwanyi anaghi ari elf oji.
A naghi ago Oji ebe mmadu nwuru.
Nwanyi anaghi Igo oji
O bu okenye na awa Oji ebe Ufodu N’ALA igbo nwata nwaoke na awa ya .
O bu aru n’ala igbo mmadu Izu ohi Oji.
Ndi mere aru n’obodo adighi awa Oji.
N’ogbako ndi igbo o bu asusu igbo ka e ji ago Oji.

IGO OJI
A na ago Oji tupu awaa Oji. Igo Oji bu uzo ndi igbo na ndi nnanna ha ji enwe mmekorita .Ha ji ya akwanyere ndi iche ugwu.

OMUMAATU IGO OJI
Onye wetara Oji wetara ndu
Ise. e e e e
Egbe bere ugo bere nke si ibe ya ebela nku Kwaa ya o
Ise e e e e
Anyi taa Oji anyi atata ndu ahu ike na oganihu…….
Ise e e e e
Anyi ga amu ozuzu Eke na ozuzu Orie
Ise e e e e
Ndi nnanna anyi ha taa oji
Ise e e e e
O bu Ukwu ijiiri bia ka iji ala
Ise e e e e
Ndi Ajo mmuo agaghi ahu gi
Ise e e e e
Ajo mmadu agagji ahu gi
Ise e e e e
Ochu okuko nwe ada nwa okuko nwe Nwenwe oso
Ise e e e e
A waa Oji o bu nwata n’etiti ha ga ebughari Oji-a na Ebido n’okenye Kere Oji gawa.

Leave a Reply