ASUSU IGBO

ISIOKWU: OKWUIHU NA OKWUOZI (Direct And Indirect Speech)

(JSS1)

          Okwuihu bụ okwu e kwuru dịka onye kwuru okwu si kwuo ya n’ewepụghị ihe ọbula maọbụ tinye ihe ọbụlaA na-etinye akarangwụ (”  “)n’okwuihu ọbụla n’asụsụ igbo .Ọmụaatụ:

  1. a) okeke sịrị, “Chukwu gọzie gị”.
  2. b) Nna m sịrị, “Gaa ije gị nke ọma”.
  3. ch) Nneka sịrị, “Jeenu ahịa”.
  4. d) obika sịrị, “Ewu ataala m igu n’isi”.
  5. e) Nwoke ahụ sịrị “Ahụ ọ dịkwa m”?

   OKWUOZI (Indirect speech)

   Okwuozi  bụ okwu mmadụ kwuru a kọwara n’ụzọ ọzọ N’okwuozi,a na-enwe ihe mgbanwe n’ihi na okwu anaghizi adi ka onye kwuru ya si kwuo ya. A na-ewebata ụmụ irighiri ihe n’okwu ahụ iji kọwapụta okwuozi a naghị etinye ya akara ngwu ọmụmaatụ:

a)okeke sịrị {ka} chukwu gọzie gi.

  1. b) Nna m sịrị {ka} ị gaa ije gị nke ọma
  2. ch) Nneka sịrị ka ụnụ jee ahịa.
  3. d) Obika sịrị na ewu ataala ua igu n’isi.

e)Nwoke ahụ jụrụ ihe bụ aha gi.

ỊTỤGHARỊ OKWUIHU KA HA BỤRỤ OKWUOZI

    Mgbe ụfọdụ mmadụ na-akọ ihe onye ọzọ kwuru,a na-eji okwu njikọ “na” egosịpụta ya.Rịkọm ngwu dị n’okwuihu ga-apụ kpam kpam.ọmumaatụ:

i)ugomma sịrị, “ahụadighị m”.(okwuihu)

ugomma sịrị {na} ahụ adịghi ya (okwuozi)

  1. ii) ọ si, “Aga m eje ahịa” (okwuozi)

ọ sị na ya ga-eje ahịa.(okwuozi).

  1. B) A na-eji “ka” atụghari okwu e kwuru ka ọ bụrụ okwu a kọrọ akọ ma ọbụrụ na okwu ahụ e kwuru bụ aririọ maọbụ okwu mmanye.

omụmaatu

  1. i) Ha sịrị, ” Biko, meere anyi ebere”(okwuihu)

   Ha rịọrọ ka e meere ha ebeere(okwuozi)

  1. ii) Azụka sịrị “chukwu meere ya ebere”(okwuihu)

Azụka rịọrọ ka chukwu meere ya ebere(okwuozi).

Download Document Here: JSS 1 ASUSU IGBO

Leave a Reply