ASỤSỤ IGBO
ISI OKWU:AGỤMAGỤ E DERE EDE
JSS2.
Agụmagụ e dere ede so na otu ngalaba agụmagụ lgbo.
Agụmagụ e dere ede bụ agụmagụ di iche iche e depụtara na akwụkwọ. ọ bụ mgbe agụmakwụkwọ biara n’ala lgbo ka e bidoro ide agụmagụ e dere ede.
Agụmagụ e dere ede bụ nke di n’akwụkwọ nke mmadụ nwere ike izụta, gụọ ya n’echeghị ka ọkọ akụkọ bịa kọọrọ ya.
Ọtụtụ agụmagụ e dere ede bụ;-
(i) akụkọ ifo. (ii) akụkọ ọdinaala.
(iii) akụkọ a rọrọ arọ(fiction) (iv) akụkọ ihe mere eme. (non fiction)(v) ejije na abụ.
Agụmagụ e dere ede na-agbadokarị ụkwụ n’ihe dịka; akparamagwa ọha na eze, ọchịchị gọọmentị, akụ na ụba , ofufe na nkwenye ndị lgbo.
Agụmagụ e dere ede na-eleru anya ala n’ihe ndị na-aga n’etiti ọha na eze, gbaa ha n’anwụ ọ na- ewekọta ochie na ọhụrụ ọnụ, tọgbụ ha, otu n’akụkụ ibe ya, gosị oyiri maọbụ ndịiche.
NJIRIMARA AGỤMAGỤ E DERE EDE
(A)Agụmagụ e dere ede bụ nke e depụtara n’akwụkwọ.
(B)A maara ndi dere ya maọbụ onye dere ya.
(CH) Amaara mgbe e dere agụmagụ ndị a.
(D)A na-agụ ya mgbe ọbụla.
URU AGỤMAGỤ E DERE EDE BARA
(A) ọ na-enye nkuzi dị mkpa
(B)E ji ya echere oge.
(CH) Ọ na-enye ego.
(D) Ọ na-enye obi aṅụrị maọbụ obi ụtọ.
NGALABA AGỤMAGỤ E DERE EDE
Agụmagụ e dere ede nwere ngalaba ndi a:
(a) lduuazị (prose)
(b)Ejije(drama)
(c)Abụ(poem)
IHE OMUME
1)Depụta ngalaba abụọ e kere agụmagụ lgbo.
2)Gini bụ agụmagụ ọdinaala ?
3)Olee ihe atọ e ji mara agụmagụ ọdinaala?
4)Olee ihe bụ agụmagụ ụgbu a?
5)Kedụ ihe atọ e ji mara agụmagụ ugbu a.
Download Document Here ASỤSỤ IGBO JSS 2
Submit assignment via WhatsApp to 0906 345 2660, or at the school’s security post