JSS 1
ASỤSỤ IGBO
ISIOKWU;EKELE NDỊ IGBO(omenala)
Ekele bụ ihe mbụ mmadụ na mmadụ ibe ya ji ebido mkparita ụka,ọ bụ otu nime agwa di oke mkpa na ndụ onye igbo ọbụla maka na ndi igbo kwenyere na ọ bụ e kwee ekele ihu asaa.
URU IKWE EKELE BARA
Ọ na eweta mgbasa ihu.
Ọ na egosị na azụrụ nwata ezi ọzụzụ.
Ọ na enye aha ọma.
Ọ na eme ka nwata. nwee aha ọma.
Ọ na ewetarp ezinụlọ aha ọma.
UDI EKELE NDI ZURU IGBO NILE ỌNỤ NA OGE E JI EKWE YA.
Ekele Ụtụtụ; Ekele ụtụtụ bụ okwu mbu onye di nta na ekwuru onye okenye ozugbo ọ hụrụ ya n’ụtụtụ
Ụfọdụ Ha Bụ Ndia;
Ị saala chi
Ị bọọla chi
Ị teela
Ụtụtụ ọma
Ekele Abalị :
ka chi foo
ka chi bọọ
EKELE ỌRỤ
Daalụ ọrụ
Deeme
jisie ike
Anwụchula
EKELE ỤZỌ
Ị gawala
Ndewo
Gaanụ
Nnọọ
Ekele Onye Emere Ihe Ọma.
Imeela
Dalụ
mmamma
ARỤMARỤ (JSS 1)
DEE AHA IME OBODO GI MA DEAỤTA EKELE E JI MARA UNU
SUBMIT VIA WHATSAPP TO 0906 345 2660, OR AT THE SCHOOL’S SECURITY POST
DOWNLOAD DOCUMENT HERE: JSS 1 ASUSU IGBO